Ọpụpụ 33:12
Exodus 33:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe Mosis na Onyenwe anyị nọ na-ekwurịta okwu, ihe Mosis gwara ya bụ nke a, “Ọ dịla anya kemgbe ị na-agwa m sị m, ‘Duru ndị m baa nʼala ahụ e kwere na nkwa inye ha.’ Ma matakwa na ị gwabeghị m onye ị ga-edunyere m ga-eduzi m ụzọ. I kwuola na ị maara aha m, kwukwaa na achọtala m ihuọma nʼebe ị nọ.
Exodus 33:12 in English
Exodus 33:12 · Berean Standard Bible
Then Moses said to the LORD, “Look, You have been telling me, ‘Lead this people up,’ but You have not let me know whom You will send with me. Yet You have said, ‘I know you by name, and you have found favor in My sight.’
Context
10Nʼoge ọbụla, ndị mmadụ hụrụ ogidi igwe ojii ahụ ka o guzo nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu nzute ahụ, ha onwe ha na-eguzokwa, onye ọbụla, nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ha, kpọọ isiala. 11Nʼime ụlọ nzute ahụ, Onyenwe anyị na-agwa Mosis okwu ihu na ihu, dịka mmadụ sị agwa enyi ya okwu. Mgbe ha kparịchara ụka, Mosis na-alọghachi azụ nʼebe ụmụ Izrel mara ụlọ ikwu ha. Ma nwokorobịa ahụ na-enyere ya aka, bụ Joshua, nwa Nun, na-anọgide nʼụlọ ikwu nzute ahụ. 12Mgbe Mosis na Onyenwe anyị nọ na-ekwurịta okwu, ihe Mosis gwara ya bụ nke a, “Ọ dịla anya kemgbe ị na-agwa m sị m, ‘Duru ndị m baa nʼala ahụ e kwere na nkwa inye ha.’ Ma matakwa na ị gwabeghị m onye ị ga-edunyere m ga-eduzi m ụzọ. I kwuola na ị maara aha m, kwukwaa na achọtala m ihuọma nʼebe ị nọ. 13Biko, ọ bụrụ na o si otu a dị, zi m ụzọ gị, nke ga-eme ka m mata gị, gaakwa nʼihu inweta ihuọma site nʼebe ị nọ. Chetakwa na mba a dị ukwu bụ ndị gị.” 14Ọ zara sị, “Mụ onwe m ga-eso gị gaa, aga m enyekwa gị izuike.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.