Native Bible

Exodus 32:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Erọn hụrụ na ụmụ Izrel jupụtara nʼobi aṅụrị, nʼihi ihe ahụ ọ kpụrụ, o wuru ebe ịchụ aja nʼihu nwa ehi ahụ ọ kpụrụ, kwuo okwu sị, “Echi, a ga-enwe oke mmemme nye Onyenwe anyị!”

Exodus 32:5 in English

Exodus 32:5 · Berean Standard Bible

When Aaron saw this, he built an altar before the calf and proclaimed: “Tomorrow shall be a feast to the LORD.”

Context

3Ngwangwa, ha niile yipụrụ ọlantị ha weta ha nye Erọn. 4Ọ naara ya nʼaka ha, were ngwa ọrụ e ji egbunye akara, kpụtara ha arụsị nwa oke ehi. Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke sitere nʼala Ijipt dupụta unu.” 5Mgbe Erọn hụrụ na ụmụ Izrel jupụtara nʼobi aṅụrị, nʼihi ihe ahụ ọ kpụrụ, o wuru ebe ịchụ aja nʼihu nwa ehi ahụ ọ kpụrụ, kwuo okwu sị, “Echi, a ga-enwe oke mmemme nye Onyenwe anyị!” 6Ya mere na echi ya, ha biliri nʼoge, bido ịchụ aja nsure ọkụ, na aja udo, nye nwa ehi ahụ a kpụrụ akpụ. Mgbe nke a gasịrị, ha nọdụrụ ala iri ihe na ịṅụ ihe ọṅụṅụ, biliekwa ọtọ gwurie egwu ime onwe ha obi ụtọ. 7Nʼoge ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị, “Gbada ọsịịsọ, nʼihi na ndị gị, ndị i dupụtara site nʼIjipt emerụọla onwe ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.