Native Bible

Exodus 32:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ahụ kwuo sị, “Onye ọbụla dịnyeere Onyenwe anyị ya bịakwute m.” Ndị Livayị niile bịakwutere ya.

Exodus 32:26 in English

Exodus 32:26 · Berean Standard Bible

So Moses stood at the entrance to the camp and said, “Whoever is for the LORD, come to me.” And all the Levites gathered around him.

Context

24Asịrị m ha, ‘Onye ọbụla nke nwere ihe ịchọ ọma ọlaedo, ya yipu ya.’ Mgbe ahụ, ha wetara m ọlaedo ndị a, nke m tụbara nʼime ọkụ. Ihe si na ya pụta bụ nwa ehi a kpụrụ akpụ!” 25Mosis hụrụ na omume ndị a jọgbuziri onwe ya na njọ nʼihi na Erọn mere ka isi kopu ha. Nke mere ka ha bụrụzia ihe ọchị nʼebe ndị iro ha dị. 26O guzoro nʼọnụ ụzọ ụlọ ikwu ahụ kwuo sị, “Onye ọbụla dịnyeere Onyenwe anyị ya bịakwute m.” Ndị Livayị niile bịakwutere ya. 27Mgbe ahụ, ọ sịrị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke nke Izrel kwuru, ‘Nwoke ọbụla nyara mma agha ya nʼakụkụ ya,* jegharịa nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ụmụ Izrel, site nʼotu isi ruo nʼisi nke ọzọ. Ya gbuo ọbụladị nwanne ya nwoke, maọbụ enyi ya, maọbụ onye agbataobi ya.’ ” 28Ndị Livayị mezuru ihe Mosis gwara ha. Ya mere ndị nwụrụ nʼụbọchị ahụ dị puku mmadụ atọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.