Native Bible

Exodus 32:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Erọn zara sị ya, ka iwe gị ghara ịdị ọkụ, onyenwe m. Gị onwe gị maara ndị a, mata otu ha si bụrụ ndị ọjọọ.

Exodus 32:22 in English

Exodus 32:22 · Berean Standard Bible

“Do not be enraged, my lord,” Aaron replied. “You yourself know that the people are intent on evil.

Context

20Mosis weere nwa oke ehi ahụ ha kpụrụ akpụ, kpọọ ya ọkụ. Mgbe ahụ, o gweriri ya dịka ntụ. Fesaa ya nʼelu mmiri mee ka ụmụ Izrel ṅụọ mmiri ahụ. 21Ọ gwara Erọn okwu sị, “Gịnị ka ndị a mere gị i ji bute ụdị mmehie ọjọọ dị otu a tụkwasị ha nʼisi?” 22“Erọn zara sị ya, ka iwe gị ghara ịdị ọkụ, onyenwe m. Gị onwe gị maara ndị a, mata otu ha si bụrụ ndị ọjọọ. 23Ha sịrị m, ‘Meere anyị chi ndị ga-edu anyị, nʼihi na nwoke a bụ Mosis onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt, anyị amaghị ihe mere ya.’ 24Asịrị m ha, ‘Onye ọbụla nke nwere ihe ịchọ ọma ọlaedo, ya yipu ya.’ Mgbe ahụ, ha wetara m ọlaedo ndị a, nke m tụbara nʼime ọkụ. Ihe si na ya pụta bụ nwa ehi a kpụrụ akpụ!”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.