Native Bible

Exodus 32:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Erọn zara sị ha, “Yipụtanụ ọlantị ọlaedo ndị nwunye unu, na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom yi. Wetara m ha.”

Exodus 32:2 in English

Exodus 32:2 · Berean Standard Bible

So Aaron told them, “Take off the gold earrings that are on your wives and sons and daughters, and bring them to me.”

Context

1Mgbe ndị mmadụ ahụ hụrụ na Mosis anọọla ọdụ ịrịdata site nʼelu ugwu Saịnaị, ha zukọtara, bịakwute Erọn, sị ya, “Bilie, meere anyị chi ndị ga-edu anyị, nʼihi na nwoke a bụ Mosis onye dupụtara anyị site nʼala Ijipt, anyị amaghị ihe mere ya.” 2Erọn zara sị ha, “Yipụtanụ ọlantị ọlaedo ndị nwunye unu, na ụmụ unu ndị ikom na ndị inyom yi. Wetara m ha.” 3Ngwangwa, ha niile yipụrụ ọlantị ha weta ha nye Erọn. 4Ọ naara ya nʼaka ha, were ngwa ọrụ e ji egbunye akara, kpụtara ha arụsị nwa oke ehi. Mgbe ahụ, ha kwuru sị, “Ndị Izrel, ndị a bụ chi unu, nke sitere nʼala Ijipt dupụta unu.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.