Native Bible

Exodus 32:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ma Mosis zara sị, “Mba, nke a abụghị ụzụ ndị meriri nʼagha, maọbụ ụzụ ndị e meriri nʼagha, kama ọ bụ olu abụ ka m na-anụ.”

Exodus 32:18 in English

Exodus 32:18 · Berean Standard Bible

But Moses replied: “It is neither the cry of victory nor the cry of defeat; I hear the sound of singing!”

Context

16Mbadamba nkume ndị ahụ bụ akaọrụ Chineke, ihe e dere nʼelu ha bụ ihe Chineke nʼonwe ya dekwasịrị nʼelu mbadamba nkume ndị ahụ. 17Mgbe Joshua nụrụ ụzụ si na ndịda ugwu ahụ, nke ụmụ Izrel niile na-eme, ọ gwara Mosis okwu sị, “Ụzụ agha dị nʼọmụma ụlọ ikwu.” 18Ma Mosis zara sị, “Mba, nke a abụghị ụzụ ndị meriri nʼagha, maọbụ ụzụ ndị e meriri nʼagha, kama ọ bụ olu abụ ka m na-anụ.” 19Mgbe Mosis bịaruru nso ebe ahụ ha mara ụlọ ikwu ha, hụ nwa oke ehi ahụ a kpụrụ akpụ na egwu a na-ete, iwe were ya nke ukwuu. Ọ tụpụrụ mbadamba nkume ndị ahụ o ji nʼaka. Kụrie ha na ndịda ugwu ahụ. 20Mosis weere nwa oke ehi ahụ ha kpụrụ akpụ, kpọọ ya ọkụ. Mgbe ahụ, o gweriri ya dịka ntụ. Fesaa ya nʼelu mmiri mee ka ụmụ Izrel ṅụọ mmiri ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.