Native Bible

Exodus 28:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Were nkume ọniks abụọ, gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu ya,

Exodus 28:9 in English

Exodus 28:9 · Berean Standard Bible

Take two onyx stones and engrave on them the names of the sons of Israel:

Context

7Ọ ga-enwe akwa nʼubu ya abụọ nke e ji ejikọta ọnụ nkuku ya abụọ, ka e nwe ike na-ekechisi ya ike. 8Ihe okike nke ukwu ahụ nke onye ǹka kpaziri nke ọma ga-adị ka ya. Ya na efọọd ahụ bụ otu, nke e ji ogho na-acha edo edo, nke anụnụ anụnụ, na ngwakọta anụnụ na uhie na uhie uhie, nakwa nke ezi akwa ọcha a kpara nke ọma mee. 9“Were nkume ọniks abụọ, gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu ya, 10nʼusoro dịka e si mụọ ha, isii nʼelu otu nkume, isii fọdụrụ na nkume nke ọzọ. 11Gbunye aha ụmụ ndị nwoke Izrel nʼelu nkume abụọ ndị ahụ, dịka onye ǹka si egbunye akara na nkume. Mgbe ahụ, hịọnye nkume ndị ahụ nʼime ihe ọlaedo ahụ a kpara akpa,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.