Ọpụpụ 28:36
Exodus 28:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee efere ntakịrị, gbunye akara dị otu a nʼelu ya: Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị.
Exodus 28:36 in English
Exodus 28:36 · Berean Standard Bible
You are to make a plate of pure gold and engrave on it as on a seal: HOLY TO THE LORD.*
Context
34Nʼọnụ ọnụ ala uwe mwụda ahụ, a ga-adụnye otu ataṅụ ọlaedo, otu oyiyi mkpụrụ pomegranet, gbaa gburugburu. 35Mgbe ọbụla Erọn na-eje ozi ya, ọ ghaghị iyi ya. Aga na anụ mgbịrịgba ataṅụ ahụ ka ọ na-akụ, mgbe ọ banyere nʼEbe Nsọ ahụ nʼihu Onyenwe anyị, na mgbe o si nʼebe ahụ na-apụta, ka ọ ghara ịnwụ. 36“Ị ga-ejikwa ọlaedo a nụchara anụcha mee efere ntakịrị, gbunye akara dị otu a nʼelu ya:
Ihe nsọ dịrị Onyenwe anyị. 37Kenye eriri na-acha anụnụ anụnụ i ji jikọta ya na ihe ike nʼisi ahụ; ọ ga-adị nʼihu akwa ike nʼisi ahụ. 38Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn. Ọ ga-ebukwa ikpe ọmụma metụtara njehie gbasara ihe nsọ niile nke ụmụ Izrel doro nsọ, na onyinye ha niile. Ọ ga-adị nʼegedege ihu Erọn mgbe niile, ka ha bụrụ ndị Onyenwe anyị ga-anabata.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.