Native Bible

Exodus 27:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jiri osisi akashia mee mkpara osisi maka ebe ịchụ aja ahụ, were bronz machie ha.

Exodus 27:6 in English

Exodus 27:6 · Berean Standard Bible

Additionally, make poles of acacia wood for the altar and overlay them with bronze.

Context

4Ị ga-eme ngịga mbadamba, ihe ọkpụkpa bronz, meekwa mgbaaka bronz nke ga-adị nʼakụkụ anọ nke ngịga ahụ. 5Tinye ya nʼokpuru oghere dị nʼebe ịchụ aja ahụ. Tinye ya ka ọ dịrị nʼetiti ebe ịchụ aja ahụ. 6Jiri osisi akashia mee mkpara osisi maka ebe ịchụ aja ahụ, were bronz machie ha. 7A ga-eme ka mkpara ahụ baa nʼime mgbaaka ndị ahụ, ka ha dị nʼakụkụ abụọ nke ebe ịchụ aja ahụ mgbe ọbụla a na-ebu ya. 8Jiri obodobo osisi rụọ ebe ịchụ aja ahụ, ka o nwee oghere nʼime, dịka igbe. Ị ga-arụ ya dịka e gosiri gị nʼelu ugwu ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.