Native Bible

Exodus 26:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Dọnye tebul ahụ na mpụta nke akwa mgbochi ahụ, nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ. Dọnyekwa ihe ịdọkwasị iheọkụ na ncherita ihu tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda.

Exodus 26:35 in English

Exodus 26:35 · Berean Standard Bible

And place the table outside the veil on the north side of the tabernacle, and put the lampstand opposite the table, on the south side.

Context

33Konye akwa mgbochi ahụ na nko ndị ahụ, ma dọnye igbe ihe ama ahụ nʼazụ akwa mgbochi ahụ. Akwa mgbochi ahụ ga-ekewapụ Ebe Nsọ ahụ site nʼEbe Kachasị Nsọ.* 34Tinye ihe mkpuchi mmehie ahụ nʼelu igbe ihe ama nʼime Ebe Kachasị Nsọ. 35Dọnye tebul ahụ na mpụta nke akwa mgbochi ahụ, nʼakụkụ ugwu nke ụlọ nzute ahụ. Dọnyekwa ihe ịdọkwasị iheọkụ na ncherita ihu tebul ahụ, nʼakụkụ ndịda. 36“Ị ga-eme akwa mgbochi maka ọnụ ụzọ mbata nke ụlọ ikwu ahụ nke eji ogho na-acha anụnụ anụnụ na ngwakọta anụnụ na uhie, na uhie uhie, na ezi akwa ọcha a kpara nke ọma, nke bụ akaọrụ onye ǹka. 37Ị ga-arụrụ akwa mgbochi a anya nko ọlaedo na ogidi ise nke osisi akashia nke e ji ọlaedo machie. Ị ga-arụkwa ụkwụ bronz ise maka ha. 26:33 Ọ bụ naanị onyeisi nchụaja na-aba nʼime ebe ahụ a na-akpọ Ebe Kachasị Nsọ. Ọ bụ naanị otu ụbọchị nʼafọ, nke bụ ụbọchị ikpuchi mmehie ndị Izrel, ka ọ na-aba nʼebe ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.