Ọpụpụ 25:27
Exodus 25:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbaaka ndị ahụ ga-adị nso nso, ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, i ji ebu tebul ahụ.
Exodus 25:27 in English
Exodus 25:27 · Berean Standard Bible
The rings are to be close to the rim, to serve as holders for the poles used to carry the table.
Context
25Ị ga-etinye ihe njikọta a kpụrụ akpụ gburugburu ọnụ ọnụ ya, nke ga-aha ka otu ọbụ aka* dimkpa. A ga-eji mpempe ọlaedo techie ihe njikọta ahụ gburugburu. 26Kpụọ mgbaaka ọlaedo anọ maka tebul ahụ, kwụnye ha nʼakụkụ anọ ahụ nke ụkwụ anọ ya. 27Mgbaaka ndị ahụ ga-adị nso nso, ihe njikọ ahụ ka ha jide mkpara ndị ahụ, i ji ebu tebul ahụ. 28Jiri osisi akashia mee mkpara a ga-eji na-ebu tebul ahụ. Jiri ọlaedo techie ha. 29Ọzọkwa, jiri ọlaedo a nụchara anụcha kpụọ efere dị iche iche, na iko dị iche iche, na ọkwa dị iche iche, nke e ji awụpụ onyinye.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.