Native Bible

Exodus 25:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Cherubim ndị a ga-agbasa nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ ga-eche onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị.

Exodus 25:20 in English

Exodus 25:20 · Berean Standard Bible

And the cherubim are to have wings that spread upward, overshadowing the mercy seat. The cherubim are to face each other, looking toward the mercy seat.

Context

18Ị ga-eji ọlaedo a nụchara anụcha, nke e tipịara etipịa kpụọ cherubim abụọ na nsọtụ abụọ nke ebe mkpuchi ahụ. 19Rụọ otu cherub nʼotu nsọtụ, otu cherub na nsọtụ nke ọzọ; mee ka cherubim ndị a na okwuchi igbe ahụ bụrụ otu na nsọtụ abụọ ahụ. 20Cherubim ndị a ga-agbasa nku ha laa elu, were ha na-ekpuchi okwuchi ahụ. Cherubim ndị ahụ ga-eche onwe ha ihu, na-ele anya nʼebe okwuchi ahụ dị. 21Tụkwasị ihe mkpuchi ahụ nʼelu igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Tinyekwa Ihe Ama ahụ m nyere gị nʼime igbe ahụ. 22Nʼebe ahụ, nʼetiti cherubim abụọ ndị ahụ dị nʼelu ihe mkpuchi igbe ọgbụgba ndụ, ka m ga-ezute gị, nye gị iwu niile ị ga-enye ndị Izrel.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.