Native Bible

Exodus 23:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Aga m ezipu oke ụjọ m ka ọ nọrọ unu nʼihu tinye ọgbaaghara nʼime mba niile unu ga-ezute. Aga m eme ka ndị iro unu tụgharịa gbaa ọsọ.

Exodus 23:27 in English

Exodus 23:27 · Berean Standard Bible

I will send My terror ahead of you and throw into confusion every nation you encounter. I will make all your enemies turn and run.

Context

25Ma unu ga-efe Onyenwe anyị bụ Chineke unu. Mgbe ahụ, ngọzị ya ga-adịkwasị nri unu na mmiri ọṅụṅụ unu. Aga m ewezugakwa ọrịa nʼetiti unu. 26Nwanyị aga na nwanyị ime ya na-apụ agaghị adị nʼala unu. Aga m emekwa ka unu nwee ogologo ndụ. 27“Aga m ezipu oke ụjọ m ka ọ nọrọ unu nʼihu tinye ọgbaaghara nʼime mba niile unu ga-ezute. Aga m eme ka ndị iro unu tụgharịa gbaa ọsọ. 28Ọzọkwa, aga m eziga ebu ka ọ chụpụ ndị Hiv na ndị Kenan na ndị Het site nʼụzọ unu. 29Ma agaghị m achụpụ ha nʼotu afọ, nʼihi na nke a ga-eme ka ala ahụ niile tọgbọrọ nʼefu, ụmụ anụ ọhịa a baa ụba karịa unu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.