Ọpụpụ 22:13
Exodus 22:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na anụ ọhịa gburu ya, ọ ga-eweta ụfọdụ nʼime anụ ahụ a dọgburu adọgbu, iji gosi na anụ ọhịa dọgburu ya.* Ọ ga-esikwa otu a gbanarị ikpe ọmụma. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụkwa ụgwọ ọbụla nʼihi anụ ụlọ ahụ.
Exodus 22:13 in English
Exodus 22:13 · Berean Standard Bible
If the animal was torn to pieces, he shall bring it as evidence; he need not make restitution for the torn carcass.
Context
11mgbe ahụ, onye agbataobi ahụ e nyere anụ ndị a nʼaka idebe ga-aṅụ iyi nʼihu Onyenwe anyị. Iyi ahụ ọ ṅụrụ ga-egosi onyenwe anụ ụlọ ahụ na o zughị ya nʼohi. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụghachi ụgwọ ọbụla. 12Ma ọ bụrụ na o zuru anụ ụlọ ahụ nʼohi site na nke agbataobi ya, ọ ghaghị ịkwụghachi ụgwọ niile nye onyenwe ya. 13Ọ bụrụ na anụ ọhịa gburu ya, ọ ga-eweta ụfọdụ nʼime anụ ahụ a dọgburu adọgbu, iji gosi na anụ ọhịa dọgburu ya.* Ọ ga-esikwa otu a gbanarị ikpe ọmụma. Nʼihi nke a, ọ gaghị akwụkwa ụgwọ ọbụla nʼihi anụ ụlọ ahụ. 14“Ọ bụrụ na mmadụ agbaziri anụ ụlọ site nʼaka onye agbataobi ya, ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ anwụọ, maọbụ merụọ ahụ mgbe onyenwe ya na-anọghị nʼebe ahụ, onye ahụ a gbazinyere anụ ụlọ ahụ ga-akwụ ụgwọ ya. 15Ọ bụrụ na anụ ụlọ ahụ nọ na nke onyenwe ya, onye gbaziri ya agaghị akwụ ụgwọ ọbụla. Ọ bụrụ na a kwụrụ ego mgbazi ọbụla nʼisi anụmanụ a, onye gbaziri ya agaghị akwụghachi ego ọbụla, nʼihi na ego mgbazi ọ kwuru ka a ga-ewere dịka ụgwọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.