Ọpụpụ 20:25
Exodus 20:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na unu ewuo ebe ịchụ aja nkume, unu ejikwala nkume a wara awa, nʼihi na unu ga-eme ka ọ ghara ịdị nsọ ma ọ bụrụ na unu ejiri ngwa ọrụ wagharịa nkume ya.
Exodus 20:25 in English
Exodus 20:25 · Berean Standard Bible
Now if you make an altar of stones for Me, you must not build it with stones shaped by tools; for if you use a chisel on it, you will defile it.
Context
23Unu emerela onwe unu chi ọzọ tinyere m, chi ọlaọcha maọbụ chi ọlaedo. Unu emerela onwe unu ha. 24“ ‘Ebe ịchụ aja unu ga-ewuru m ga-abụ nke unu ji naanị aja wuo. Nʼebe ahụ ka unu ga-achụrụ m aja nsure ọkụ na aja udo. Unu ga-ejikwa igwe ewu na atụrụ, na ehi chụọrọ m aja. Unu ga-ewuru m ebe ịchụ aja naanị ebe ọbụla m mere ka aha m bụrụ ihe a na-asọpụrụ, nʼebe ahụ ka m ga-abịa gọzie unu. 25Ọ bụrụ na unu ewuo ebe ịchụ aja nkume, unu ejikwala nkume a wara awa, nʼihi na unu ga-eme ka ọ ghara ịdị nsọ ma ọ bụrụ na unu ejiri ngwa ọrụ wagharịa nkume ya. 26Unu ejila ihe nrigo gbagoro nʼebe ịchụ aja m, ka a ghara ikpughe ọtọ unu nʼelu ya.’
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.