Ọpụpụ 20:19
Exodus 20:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
sị Mosis, “Biko ka gị onwe gị gwa anyị okwu, anyị ga-anụ ma ka Chineke gharakwa ịgwa anyị okwu, ma ọ bụghị ya, anyị ga-anwụ.”
Exodus 20:19 in English
Exodus 20:19 · Berean Standard Bible
“Speak to us yourself and we will listen,” they said to Moses. “But do not let God speak to us, or we will die.”
Context
17Gị enwela anya ukwu nʼebe ụlọ onye agbataobi gị dị. Gị enwekwala anya ukwu nʼebe nwunye onye agbataobi gị dị, maọbụ ohu ya nwoke maọbụ ohu ya nwanyị, ehi ya maọbụ ịnyịnya ibu ya, ma ọ bụkwanụ nʼihe ọbụla nke onye agbataobi gị nwere dị.” 18Mgbe ndị Izrel hụrụ egbe eluigwe, na amụma ọkụ, na opi ike, hụkwa ugwu ahụ ka o jupụtakwara nʼanwụrụ ọkụ, ha mara jijiji nʼihi egwu. Ha guzoro nʼebe dị anya, 19sị Mosis, “Biko ka gị onwe gị gwa anyị okwu, anyị ga-anụ ma ka Chineke gharakwa ịgwa anyị okwu, ma ọ bụghị ya, anyị ga-anwụ.” 20Mosis sịrị ndị Izrel, “Unu atụkwala ụjọ, nʼihi na Chineke bịara ịnwale unu ime ka unu na-atụ ya egwu mgbe ọbụla ka unu ghara imehie megide ya.” 21Nʼihi nke a, mmadụ niile guzoro nʼebe dị anya site nʼugwu ahụ. Ma Mosis bara nʼime igwe ojii ahụ, ebe Chineke nʼonwe ya nọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.