Native Bible

Exodus 16:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha mere dịka Mosis gwara ha. Mgbe chi echi bọrọ, ha chọpụtara na nri ha dị mma dịkwa ụtọ, ikpuru adịghịkwa nʼime ya.

Exodus 16:24 in English

Exodus 16:24 · Berean Standard Bible

So they set it aside until morning as Moses had commanded, and it did not smell or contain any maggots.

Context

22Nʼụbọchị nke isii, ha na-ewere nri okpukpu abụọ karịa ka ha na-ewe nʼụbọchị ndị ọzọ. Mgbe ndịisi nzukọ Izrel hụrụ mgbanwe dị otu a, ha bịara kọọrọ Mosis. 23Mosis zara sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere: ‘Ụbọchị echi bụ ụbọchị izuike, ụbọchị nke asaa dị nsọ nye Onyenwe anyị. Ya mere, sienụ ihe niile unu nwere isi taa, nʼihi na unu agaghị esi ihe ọbụla echi. Nri ọbụla unu rifọrọ, hapụnụ ya ka ọ bụrụ nri unu ga-eri echi.’ ” 24Ha mere dịka Mosis gwara ha. Mgbe chi echi bọrọ, ha chọpụtara na nri ha dị mma dịkwa ụtọ, ikpuru adịghịkwa nʼime ya. 25Mosis gwara ha sị, “Nke a ga-abụ ihe oriri unu taa, nʼihi na ọ bụ ụbọchị izuike nye Onyenwe anyị. Ọ dịghị nri unu ga-ahụ nke unu ga-achịkọta taa. 26Abalị isii ka unu ga-achịkọta nri unu ga-eri. Ma nʼabalị nke asaa bụ ụbọchị izuike, unu agaghị ahụ nri unu ga-achịkọta.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.