Native Bible

Exodus 13:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Rienụ achịcha na-ekoghị eko nʼime ụbọchị asaa ndị ahụ. Achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee agaghị adị nʼụlọ unu. Achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee agaghị adị nʼoke ala unu niile.

Exodus 13:7 in English

Exodus 13:7 · Berean Standard Bible

Unleavened bread shall be eaten during those seven days. Nothing leavened may be found among you, nor shall leaven be found anywhere within your borders.

Context

5Mgbe Onyenwe anyị dubatara unu nʼala ndị Kenan, ndị Het, ndị Amọrait, ndị Hiv na ndị Jebus bi nʼime ya, bụ ala ahụ ọ ṅụrụ nʼiyi nye nna nna unu ha na ọ ga-enye unu, ala mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-eru na ya, unu ga-eme ofufe mmemme a nʼọnwa a. 6Unu ga-eri achịcha na-ekoghị eko ụbọchị asaa ahụ. Nʼụbọchị nke ikpeazụ nʼime ụbọchị asaa ahụ, unu ga-eme mmemme oke oriri nʼihu Onyenwe anyị. 7Rienụ achịcha na-ekoghị eko nʼime ụbọchị asaa ndị ahụ. Achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee agaghị adị nʼụlọ unu. Achịcha e ji ihe na-eko achịcha mee agaghị adị nʼoke ala unu niile. 8Nʼoge ọbụla ị na-eme mmemme a, kọwaara nwa gị nwoke ihe kpatara i ji eme mmemme a, si ya, ‘Ana m eme mmemme a maka icheta ihe Onyenwe anyị meere m, mgbe m si nʼIjipt pụta.’ 9Imezu mmemme a ga-adịrị unu dịka ihe ịrịbama nʼala unu, dịrịkwa ka ihe ngosi nʼegedege ihu unu, ichetara unu na Onyenwe anyị ji aka ike ya dupụta anyị site nʼala Ijipt.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.