Native Bible

Exodus 13:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Fero mesiri obi ya ike, jụ ka anyị si nʼala ya pụọ, Onyenwe anyị gburu ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ ma anụ ụlọ. Nʼihi ya, ana m eji ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ achụ aja nye Onyenwe anyị. Ma ụmụ m ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ ka m na-agbapụta.’

Exodus 13:15 in English

Exodus 13:15 · Berean Standard Bible

And when Pharaoh stubbornly refused to let us go, the LORD killed every firstborn in the land of Egypt, both of man and beast. This is why I sacrifice to the LORD the firstborn male of every womb, but I redeem all the firstborn of my sons.’

Context

13Jiri nwa atụrụ gbapụta nwa ịnyịnya ibu* mbụ e bụ ụzọ mụọ. Ọ bụrụ na unu achọghị ịgbara nwa ịnyịnya ibu ahụ, unu aghaghị ịgbaji ya olu. Ma unu aghaghị ịgbara ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ. 14“Nʼoge dị nʼihu, mgbe nwa gị nwoke ga-ajụ gị sị, ‘Gịnị ka ihe ndị a pụtara?’ Ị ga-azaghachi ya sị, ‘Onyenwe anyị jiri aka ike dị ukwu dupụta anyị site nʼIjipt, site nʼala nke ohu. 15Mgbe Fero mesiri obi ya ike, jụ ka anyị si nʼala ya pụọ, Onyenwe anyị gburu ụmụ ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ ma anụ ụlọ. Nʼihi ya, ana m eji ụmụ oke anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ achụ aja nye Onyenwe anyị. Ma ụmụ m ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ ka m na-agbapụta.’ 16Mmemme a ga-adị ka ihe ịrịbama nʼanya unu, dịrịkwa ka ihe ngosi nʼegedege ihu unu, ichetara unu na Onyenwe anyị ji aka ike ya dupụta anyị site nʼala Ijipt.” 17Mgbe Fero mesịrị kwere ka ụmụ Izrel laa, Chineke edughị ha site nʼụzọ ahụ gafere ala ndị Filistia. Ọ bụ ezie na ụzọ ahụ dị nso karịa.* Chineke mere nke a nʼihi na o chere nʼobi ya sị, “Ọ bụrụ na ndị a ezute agha, ha nwere ike ịgbanwe obi ha tụgharịa ịlaghachi azụ nʼIjipt.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.