Native Bible

Exodus 12:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ha ga-ewere ọbara ya tee nʼelu na nʼakụkụ ibo ọnụ ụzọ nke dị nʼezinaụlọ ha niile, ebe ha ga-anọ rie anụ atụrụ ahụ.

Exodus 12:7 in English

Exodus 12:7 · Berean Standard Bible

They are to take some of the blood and put it on the sides and tops of the doorframes * of the houses where they eat the lambs.

Context

5Nwa atụrụ a ga-eweta ga-abụ oke gbara naanị otu afọ, nke na-enweghị ntụpọ ọbụla nʼahụ ya. Unu nwere ike họrọ atụrụ maọbụ ewu. 6Unu ga-elekọta ya anya ruo nʼụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa a. Nʼabalị ụbọchị ahụ ka ọgbakọ Izrel niile ga-egbu ya. 7Ha ga-ewere ọbara ya tee nʼelu na nʼakụkụ ibo ọnụ ụzọ nke dị nʼezinaụlọ ha niile, ebe ha ga-anọ rie anụ atụrụ ahụ. 8Ha ga-eri anụ atụrụ a, nke a ga-ahụ nʼọkụ nʼabalị ahụ, ya na achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ndụ na-elu ilu. 9A gaghị eri nwa atụrụ ọbụla na ndụ, a gaghị esikwa ya esi, kama a ga-ahụ ya nʼọkụ. A ga-ahụ akụkụ ahụ nwa atụrụ ọbụla nʼọkụ, tinyere isi ya, ụkwụ ya na ihe dị nʼime afọ ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.