Ọpụpụ 12:40
Exodus 12:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Tupu ha ahapụ ala Ijipt, ụmụ Izrel ebiela nʼebe ahụ narị afọ anọ na iri afọ atọ.
Exodus 12:40 in English
Exodus 12:40 · Berean Standard Bible
Now the duration of the Israelites’ stay in Egypt * was 430 years.
Context
38Ọtụtụ mmadụ dị iche iche sooro ha nʼije ha. Ha dukwa igwe anụ ụlọ, igwe ewu na atụrụ ha, nke dị ukwu nʼọnụọgụgụ. 39Ha ji ụtụ ọka ha si Ijipt buputa mee achịcha na-ekoghị eko. Nʼihi na a chụpụrụ ha achụpụ site nʼIjipt, ha enweghị ezi ohere kwadooro onwe ha ihe oriri. 40Tupu ha ahapụ ala Ijipt, ụmụ Izrel ebiela nʼebe ahụ narị afọ anọ na iri afọ atọ. 41Mgbe narị afọ anọ na iri afọ atọ zuru, nʼụbọchị ahụ o zuru, usuu ndị Onyenwe anyị niile hapụrụ Ijipt. 42Onyenwe anyị chere nche nʼabalị ụbọchị ahụ maka ịkpọpụta ha site nʼala Ijipt. Nʼihi ya, abalị ụbọchị ahụ bụ mgbe pụrụ iche nye ụmụ Izrel maka iji iche nche sọpụrụ Onyenwe anyị nʼọgbọ ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.