Ọpụpụ 12:37
Exodus 12:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe nke a gasịrị, ụmụ Izrel malitere ije ha site na Ramesis. Mgbe ha hapụrụ Ramesis, na-eje Sukọt, ha dị narị puku ndị ikom isii, na-agụghị ndị inyom na ụmụntakịrị.
Exodus 12:37 in English
Exodus 12:37 · Berean Standard Bible
The Israelites journeyed from Rameses to Succoth * with about 600,000 men on foot, besides women and children.
Context
35Ha mekwara ihe ndị ọzọ dịka Mosis gwara ha. Ha rịọrọ ndị Ijipt ka ha nye ha ihe iji ngwa nke ọlaọcha na ọlaedo, na uwe. 36Onyenwe anyị nyere ndị ya amara nʼihu ndị Ijipt, ha nyere ha ihe niile ha rịọrọ. Site nʼụzọ dị otu a, ụmụ Izrel napụtara ndị Ijipt ihe niile ha ji biri nʼụlọ. 37Mgbe nke a gasịrị, ụmụ Izrel malitere ije ha site na Ramesis. Mgbe ha hapụrụ Ramesis, na-eje Sukọt, ha dị narị puku ndị ikom isii, na-agụghị ndị inyom na ụmụntakịrị. 38Ọtụtụ mmadụ dị iche iche sooro ha nʼije ha. Ha dukwa igwe anụ ụlọ, igwe ewu na atụrụ ha, nke dị ukwu nʼọnụọgụgụ. 39Ha ji ụtụ ọka ha si Ijipt buputa mee achịcha na-ekoghị eko. Nʼihi na a chụpụrụ ha achụpụ site nʼIjipt, ha enweghị ezi ohere kwadooro onwe ha ihe oriri.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.