Native Bible

Exodus 12:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu ga-azaghachi ha sị, ‘Ọ bụ aja ngabiga anyị na-achụrụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ gafere ụlọ ụmụ Izrel nʼala Ijipt, mgbe o gburu ndị Ijipt, ma o nweghị onye ọbụla nʼime anyị o gburu.’ ”

Exodus 12:27 in English

Exodus 12:27 · Berean Standard Bible

you are to reply, ‘It is the Passover sacrifice to the LORD, who passed over the houses of the Israelites in Egypt when He struck down the Egyptians and spared our homes.’” Then the people bowed down and worshiped.

Context

25Mgbe unu batara nʼala ahụ Onyenwe anyị ga-enye unu dịka o kwere na nkwa, unu ga-edobe ofufe* a. 26Mgbe ụmụ unu ga-ajụ unu ajụjụ sị, ‘Gịnị ka ofufe a pụtara?’ 27Unu ga-azaghachi ha sị, ‘Ọ bụ aja ngabiga anyị na-achụrụ Onyenwe anyị nʼihi na ọ gafere ụlọ ụmụ Izrel nʼala Ijipt, mgbe o gburu ndị Ijipt, ma o nweghị onye ọbụla nʼime anyị o gburu.’ ” 28Ụmụ Izrel mezuru ihe niile Onyenwe anyị gwara ha site nʼọnụ Mosis na Erọn. 29Nʼime etiti abalị ụbọchị ahụ, Onyenwe anyị gburu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, malite nʼọkpara Fero onye nọ nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara nke onye Ijipt nọ nʼụlọ mkpọrọ olulu. O gbukwara ụmụ anụ ụlọ niile e bụ ụzọ mụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.