Native Bible

Exodus 12:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu agaghị erifọdụ ya ruo nʼụtụtụ echi ya. Nke ọbụla ga-afọdụ nʼabalị ahụ, a ga-akpọ ya ọkụ.

Exodus 12:10 in English

Exodus 12:10 · Berean Standard Bible

Do not leave any of it until morning; before the morning you must burn up any part that is left over.

Context

8Ha ga-eri anụ atụrụ a, nke a ga-ahụ nʼọkụ nʼabalị ahụ, ya na achịcha na-ekoghị eko, na ahịhịa ndụ na-elu ilu. 9A gaghị eri nwa atụrụ ọbụla na ndụ, a gaghị esikwa ya esi, kama a ga-ahụ ya nʼọkụ. A ga-ahụ akụkụ ahụ nwa atụrụ ọbụla nʼọkụ, tinyere isi ya, ụkwụ ya na ihe dị nʼime afọ ya. 10Unu agaghị erifọdụ ya ruo nʼụtụtụ echi ya. Nke ọbụla ga-afọdụ nʼabalị ahụ, a ga-akpọ ya ọkụ. 11Otu a ka unu ga-esi rie ya: yirinụ uwe unu, na akpụkpọụkwụ unu.* Jirikwanụ mkpara unu. Jikerenụ dịka ndị na-aga njem dị anya. Unu ga-eri anụ atụrụ a na achịcha na-ekoghị eko ngwangwa. A ga-akpọ oriri a Mmemme Ngabiga Onyenwe anyị. 12“Aga m agafe nʼala Ijipt nʼabalị ahụ, igbu ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ nʼala Ijipt, ma mmadụ, ma anụmanụ. Aga m emekwa ka ikpe ọmụma bịakwasị chi ndị ọzọ ahụ niile Ijipt na-efe ofufe. Abụ m Onyenwe anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.