Native Bible

Exodus 11:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onyenwe anyị mere ka ụmụ Izrel nweta ihuọma nʼebe ndị Ijipt, na ndị agbataobi ha nọ. Nke ka nke, Mosis ghọrọ onye a na-asọpụrụ nʼetiti ndị ozi Fero na nʼihu ndị Ijipt niile.

Exodus 11:3 in English

Exodus 11:3 · Berean Standard Bible

And the LORD gave the people favor in the sight of the Egyptians. Moreover, Moses himself was highly regarded in Egypt by Pharaoh’s officials and by the people.

Context

1Onyenwe anyị gwara Mosis, “Aga m ewetara Fero na Ijipt otu ihe otiti ọzọ. Mgbe nke a gasịrị, ọ ga-ekwe ka unu si nʼebe a pụọ. Nʼeziokwu, ọ ga-eji aka ya chụpụ unu nʼala ya. 2Gwa nwoke na nwanyị Izrel ọbụla ka ha jikere. Ha rịọọ ndị agbataobi ha bụ ndị Ijipt, ka ha nye ha ihe ọbụla e ji ọlaọcha na ọlaedo kpụọ.” 3Onyenwe anyị mere ka ụmụ Izrel nweta ihuọma nʼebe ndị Ijipt, na ndị agbataobi ha nọ. Nke ka nke, Mosis ghọrọ onye a na-asọpụrụ nʼetiti ndị ozi Fero na nʼihu ndị Ijipt niile. 4Ya mere, Mosis sịrị, “Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Nʼihe dịka nʼetiti abalị taa, aga m agafe nʼime ala Ijipt niile. 5Mgbe nke a na-eme, ndị ikom niile e bụ ụzọ mụọ* nʼala Ijipt ga-anwụ, site nʼọkpara Fero, onye nọ ugbu a nʼocheeze ya, ruo nʼọkpara ohu onye nwanyị na-akwọ ihe na nkume ịkwọ nri, na ụmụ ehi niile e bụ ụzọ mụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.