Native Bible

Exodus 10:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na ị jụ ikwere ka ha gaa, nʼụtụtụ echi, aga m ezite igurube nʼala Ijipt.

Exodus 10:4 in English

Exodus 10:4 · Berean Standard Bible

But if you refuse to let My people go, I will bring locusts into your territory tomorrow.

Context

2Nke a ga-abụ akụkọ unu ga-akọrọ ụmụ unu, na ụmụ ụmụ unu, banyere otu m si mesie ndị Ijipt ike, na otu m si rụọ ọrụ ịrịbama m nʼetiti ha, ime ka unu mata na m bụ Onyenwe anyị.” 3Ọzọ, Mosis na Erọn jekwuuru Fero gwa ya sị, “Nke a bụ ihe Onyenwe anyị Chineke ndị Hibru kwuru, ‘Ọ bụ ruo olee mgbe ka ị ga-ajụ iwedata onwe gị ala nʼihu m? Hapụ ndị m ka ha gaa fee m ofufe. 4Ọ bụrụ na ị jụ ikwere ka ha gaa, nʼụtụtụ echi, aga m ezite igurube nʼala Ijipt. 5Igurube ndị a ga-ekpuchi ihu ala Ijipt niile, ka mmadụ ọbụla hapụ ịhụ ala anya. Ha ga-erichapụ ihe ndị fọdụrụ bụ nke ifufe na mkpụrụ mmiri ahụ na-emebighị, tinyere osisi niile na-eto eto nʼubi unu. 6Ha ga-ejupụta nʼụlọ gị, na nʼụlọ ndị na-ejere gị ozi, na nʼụlọ ndị Ijipt niile. Ihe dị otu a bụ ụdị ihe na-emetụbeghị na mbụ, nke nna gị maọbụ nna nna gị ha na-ahụtụbeghị ụdị ya site na mgbe ha bidoro ibi nʼala a tutu ruo ugbu a.’ ” Mgbe ahụ, Mosis tụgharịrị hapụ Fero pụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.