Native Bible

Exodus 10:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Ijipt ahụghị ihu ibe ha. Ha ahapụghịkwa ebe obibi ha abalị atọ ahụ. Ma ụmụ Izrel nwere ìhè nʼebe niile ha bi.

Exodus 10:23 in English

Exodus 10:23 · Berean Standard Bible

No one could see anyone else, and for three days no one left his place. Yet all the Israelites had light in their dwellings.

Context

21Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis sị, “Setịpụ aka gị abụọ nʼeluigwe ka ọchịchịrị gbaa nʼala Ijipt niile.” 22Mosis setịpụrụ aka ya nʼeluigwe. Oke ọchịchịrị gbara abalị atọ nʼala Ijipt niile. 23Ndị Ijipt ahụghị ihu ibe ha. Ha ahapụghịkwa ebe obibi ha abalị atọ ahụ. Ma ụmụ Izrel nwere ìhè nʼebe niile ha bi. 24Mgbe ahụ, Fero kpọrọ Mosis sị ya, “Gaanụ fee Onyenwe anyị unu ofufe. Unu na ndị inyom na ụmụ unu nwere ike ịga, ma unu ga-ahapụ igwe ehi unu na igwe anụ ụlọ unu gaa.” 25Mosis zara, “Ị ghaghị ịhapụ anyị ka anyị were ihe aja na aja nsure ọkụ, nke anyị chee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.