Native Bible

Esther 9:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ndị Juu kwenyere ịga nʼihu ime mmemme a nke ha malitere ime, dịka Mọdekai si deere ha ya,

Esther 9:23 in English

Esther 9:23 · Berean Standard Bible

So the Jews agreed to continue the custom they had started, as Mordecai had written to them.

Context

21ka ha na-eme mmemme a kwa afọ nʼụbọchị nke iri na anọ na nke iri na ise nke ọnwa Ada ọbụla. 22Nke a bụ iji gosi mgbe ndị Juu nweere onwe ha site nʼaka ndị iro ha, na iji cheta mgbe iru ụjụ ha ghọrọ ọṅụ, na mgbe ịkwa akwa ha ghọrọ ụbọchị mmemme ọṅụ. O deere ha ka ha debe ụbọchị ndị a dịka ụbọchị mmemme ọṅụ na oriri na ọṅụṅụ, na inyerịta onwe ha onyinye ihe oriri na inye ụmụ ogbenye onyinye dị iche iche.* 23Ya mere, ndị Juu kwenyere ịga nʼihu ime mmemme a nke ha malitere ime, dịka Mọdekai si deere ha ya, 24nʼihi na Heman nwa Hamedata, onye Agag, onye iro ndị Juu niile, kpebiri ịla ha nʼiyi nʼụbọchị ahụ ọ tụpụtara site nʼife nza. 25Mgbe izu ọjọọ a ruru eze ntị, o nyere iwu nke e debanyere nʼakwụkwọ sị, ka echiche ọjọọ nke Heman megide ndị Juu tụgharịa nʼisi ya, ọ kwukwara ka akwụgbuo ya na ụmụ ndị ikom niile nʼelu osisi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.