Native Bible

Esther 9:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ndị Juu chịkọtara onwe ha ọnụ nʼobodo niile dị nʼalaeze eze Sekses, maka ịzọ ndụ ha. Ma o nweghị onye ọbụla pụrụ imegide ha, nʼihi na egwu ha dakwasịrị ndị obodo niile dị iche iche.

Esther 9:2 in English

Esther 9:2 · Berean Standard Bible

In each of the provinces of King Xerxes, the Jews assembled in their cities to attack those who sought to harm them. No man could withstand them, because the fear of them had fallen upon all peoples.

Context

1Nʼabalị iri na atọ nke ọnwa iri na abụọ, nke bụ ọnwa Ada, bụ ụbọchị a gaara emezu iwu ahụ eze nyere. Nʼụbọchị a, ndị iro ndị Juu lere anya na ha ga-ekpochapụ ha. Ma ugbu a, a tụgharịala iwu ahụ, mee ya ka ọ bụrụ ihe megidere ndị ahụ kpọrọ ndị Juu asị. 2Ndị Juu chịkọtara onwe ha ọnụ nʼobodo niile dị nʼalaeze eze Sekses, maka ịzọ ndụ ha. Ma o nweghị onye ọbụla pụrụ imegide ha, nʼihi na egwu ha dakwasịrị ndị obodo niile dị iche iche. 3Ndịisi ọchịchị obodo niile, ndị na-anọchite anya eze, na ndịisi, na ndị ozi eze, nyeere ndị Juu aka, nʼihi na ha tụrụ egwu Mọdekai. 4Nʼihi na Mọdekai bụ onye a ma ama nʼụlọeze, ọ bụkwa onye a maara aha ya nʼalaeze ahụ niile, nʼihi na ike ọchịchị ya na-abawanye ụba karịa ụbọchị niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.