Esta 8:9
Esther 8:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu mgbe ahụ, akpọrọ ndị ode akwụkwọ eze. Ọ bụ nʼiri abalị na atọ nke ọnwa atọ nʼafọ nke bụ ọnwa Sivan ka ihe ndị a mere. Ha dere iwu niile Mọdekai nyere banyere ndị Juu, ndịisi ọchịchị niile na ndị ọchịchị* niile na-elekọta mpaghara alaeze niile site nʼIndia ruo Kush.* Ọnụọgụgụ ha niile dị otu narị na iri abụọ na asaa (127). E depụtasịrị iwu ahụ nʼodide akwụkwọ nke ala ọbụla a na-achị achị si dị, na dịka asụsụ ndị ọbụla si dị, ma nyekwa ndị Juu dịka odide akwụkwọ na asụsụ ha si dị.
Esther 8:9 in English
Esther 8:9 · Berean Standard Bible
At once the royal scribes were summoned, and on the twenty-third day of the third month (the month of Sivan *), they recorded all of Mordecai’s orders to the Jews and to the satraps, governors, and princes of the 127 provinces from India to Cush *—writing to each province in its own script, to every people in their own language, and to the Jews in their own script and language.
Context
7Mgbe ahụ, eze bụ Ahasuerọs gwara Esta nwunye eze na Mọdekai onye Juu okwu sị ha, “Enyela m Esta akụnụba Heman, ha akwụgbukwaala Heman nʼosisi, nʼihi na ọ chọrọ ịla ndị Juu nʼiyi. 8Ugbu a, deenụ akwụkwọ ozi banyere ndị Juu niile, dee ihe ọbụla dị mma nʼanya unu nʼaha eze. Werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, nʼihi na ọ dịghị akwụkwọ ọbụla e dere nʼaha eze, kaakwa ya akara mgbaaka eze nke a pụrụ imegharị.” 9Otu mgbe ahụ, akpọrọ ndị ode akwụkwọ eze. Ọ bụ nʼiri abalị na atọ nke ọnwa atọ nʼafọ nke bụ ọnwa Sivan ka ihe ndị a mere. Ha dere iwu niile Mọdekai nyere banyere ndị Juu, ndịisi ọchịchị niile na ndị ọchịchị* niile na-elekọta mpaghara alaeze niile site nʼIndia ruo Kush.* Ọnụọgụgụ ha niile dị otu narị na iri abụọ na asaa (127). E depụtasịrị iwu ahụ nʼodide akwụkwọ nke ala ọbụla a na-achị achị si dị, na dịka asụsụ ndị ọbụla si dị, ma nyekwa ndị Juu dịka odide akwụkwọ na asụsụ ha si dị. 10Mọdekai dere akwụkwọ ahụ nʼaha eze, bụ Ahasuerọs, werekwa ọlaaka ikike eze kaa ya akara, zipụ akwụkwọ ndị a site nʼaka* ndị ọgba ọsọ ndị ịnyịnya na-ebu, bụ ndị na-agba ịnyịnya ụkwụ ọsọ nke e leziri anya nke ọma zụọ maka ije ozi dịrị eze. 11Akwụkwọ nke iwu eze a, nyere ndị Juu niile nọ nʼobodo ọbụla ike izukọta nʼotu maka ịzọ ndụ ha, nyekwa ha ikike ibibi, gbuo ma laa nʼiyi ndị agha nke mba ọbụla, maọbụ ala ndị ahụ a na-achị achị bụ ndị nwere ike ịla ha, ndị inyom ha na ụmụntakịrị ha nʼiyi, na ịpụnara ha akụnụba ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.