Esta 6:8
Esther 6:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nye iwu ka e wepụta uwe gị, nke gị bụ eze yitụrụla, na ịnyịnya gị, nke eze gbaarala, nke e kpukwasịrị oyiyi okpueze nʼisi ya.
Esther 6:8 in English
Esther 6:8 · Berean Standard Bible
have them bring a royal robe that the king himself has worn and a horse on which the king himself has ridden—one with a royal crest placed on its head.
Context
6Mgbe Heman batara, eze jụrụ ya ajụjụ sị, “Gịnị bụ ugwu m kwesiri inye onye mere ihe na-atọ m ụtọ?”
Heman chere nʼime onwe ya sị, “Oleekwanụ onye ọzọ eze ga-achọ inye ugwu karịa mụ onwe m?” 7Ya mere ọ zara eze, “Banyere nwoke ahụ ọ masịrị eze ịkwanyere ugwu, 8nye iwu ka e wepụta uwe gị, nke gị bụ eze yitụrụla, na ịnyịnya gị, nke eze gbaarala, nke e kpukwasịrị oyiyi okpueze nʼisi ya. 9Ka enye uwe ahụ na ịnyịnya ahụ nʼaka otu onye kachasị nwee ugwu nʼime ụmụ eze, ka ha yikwasị nwoke ahụ nke eze chọrọ ịsọpụrụ uwe ahụ, ka ịnyịnya buru ya dịka ha dọkpụ ya na-ejegharị nʼokporoụzọ niile nʼobodo, na-ekwusa nʼihu ya na-asị, ‘Otu a ka a na-emere nwoke ahụ ọ masịrị eze inye nsọpụrụ!’ ” 10Mgbe ahụ eze nyere Heman iwu, sị; “Ahaa! Ntụpụta gị dị mma nke ukwuu! Mee ngwangwa, were uwe ndị a, na ịnyịnya m, meekwara Mọdekai onye Juu ahụ na-anọdụ nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze ihe niile ndị a i kwuru. Hụkwa na i mechasịrị ihe ndị a niile i kwuru.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.