Esta 5:2
Esther 5:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ọ hụrụ Esta bụ nwunye eze ka o na-eguzo nʼogige ahụ, ihe ya masịrị ya, ọ nabatakwara ya site na ị setịpụrụ ya mkpara ọlaedo nke dị nʼaka ya. Ya mere, Esta bịaruru nso metụkwa isi mkpara ọlaedo ahụ aka.
Esther 5:2 in English
Esther 5:2 · Berean Standard Bible
As soon as the king saw Queen Esther standing in the court, she found favor in his sight. The king extended the gold scepter in his hand toward Esther, and she approached and touched the tip of the scepter.
Context
1Nʼabalị nke atọ ya, Esta yiri uwe eze nwanyị ya, guzo nʼime ime ogige ụlọeze, nke chere ihu nʼụlọ nzukọ ukwu dị nʼụlọeze, ebe eze nọdụ nʼocheeze ya chee ihu nʼọnụ ụzọ. 2Mgbe ọ hụrụ Esta bụ nwunye eze ka o na-eguzo nʼogige ahụ, ihe ya masịrị ya, ọ nabatakwara ya site na ị setịpụrụ ya mkpara ọlaedo nke dị nʼaka ya. Ya mere, Esta bịaruru nso metụkwa isi mkpara ọlaedo ahụ aka. 3Eze jụrụ ya sị, “Gịnị ka ị chọrọ, eze nwanyị Esta? Gịnị bụ mkpa gị? Aga m emere gị ya, ọ bụladị ma ọ bụrụ inye gị otu ọkara alaeze m.” 4Esta zara sị, “Ọ bụrụ na ọ masịrị eze, achọrọ m ka gị na Heman bịa rie oriri m kwadooro unu taa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.