Native Bible

Esther 5:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼagbanyeghị nke a, Heman jisiri onwe ya ike, laa nʼụlọ ya. Ọ kpọkọtara ndị enyi* ya niile na Zeresh, nwunye ya,

Esther 5:10 in English

Esther 5:10 · Berean Standard Bible

Nevertheless, Haman restrained himself and went home. And calling for his friends and his wife Zeresh,

Context

8ọ bụrụ na m ahụtala amara nʼihu eze nʼezie, ọ bụrụkwa na ọ masịrị eze imere m ihe m na-arịọ, na ime ihe m na-achọ, ka ya na Heman sorokwa bịa echi nʼoriri ọzọ m ga-akwado. Echi ka m ga-akọkwara gị ihe niile.” 9Heman hapụrụ ebe oriri ahụ nʼoke obi ụtọ. Ma mgbe ọ hụrụ Mọdekai nʼọnụ ụzọ ama eze, hụkwa na o bilighị maọbụ maa jijiji nʼihu ya, iwe were ya nke ukwuu. 10Nʼagbanyeghị nke a, Heman jisiri onwe ya ike, laa nʼụlọ ya. Ọ kpọkọtara ndị enyi* ya niile na Zeresh, nwunye ya, 11ọ nyara ha isi nʼihi oke akụnụba ya, na ọtụtụ ụmụ ndị ikom ya, nʼụzọ niile nke eze si nye ya nsọpụrụ ma bulikwaa ya elu karịa ndị ọzọ ọkwa ha dị elu na ndị ọrụ eze niile. 12Heman kwukwara sị, “Nke a abụghị dị okwu, ọ bụ naanị mụ ka Esta nwunye eze, kpọrọ ka m soro eze bịa nʼoriri nke ọ kwadooro. Echi ka ọ kpọrọ m ka m soro eze bịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.