Esta 3:1
Esther 3:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze bụ Ahasuerọs mere Heman nwa Hamedata onye Agag ka ọ bụrụ onye ukwu, o nyere ya ugwu site nʼinye ya oche dị elu karịa nke ndị ọzọ niile a na-asọpụrụ.
Esther 3:1 in English
Esther 3:1 · Berean Standard Bible
After these events, King Xerxes honored Haman son of Hammedatha, the Agagite, elevating him to a position above all the princes who were with him.
Context
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, eze bụ Ahasuerọs mere Heman nwa Hamedata onye Agag ka ọ bụrụ onye ukwu, o nyere ya ugwu site nʼinye ya oche dị elu karịa nke ndị ọzọ niile a na-asọpụrụ. 2Ndịisi ọchịchị eze niile na-egbu ikpere nʼala nye Heman nsọpụrụ mgbe ọbụla o si nʼọnụ ụzọ ama ụlọeze na-agafe, nʼihi na ọ bụ otu a ka eze nyere nʼiwu. Ma Mọdekai ekweghị egbu ikpere nye ya, ọ kwekwaghị enye ya nsọpụrụ. 3Mgbe ahụ, ndị ozi eze ndị nọ nʼọnụ ụzọ ama eze jụrụ Mọdekai ajụjụ si ya, “Gịnị mere i ji na-enupu isi nʼiwu eze nyere?”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.