Esta 2:11
Esther 2:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụbọchị niile, Mọdekai na-abịa nʼogige ụlọ ndị inyom na-ajụ ase otu Esta mere, nʼịchọpụta otu ihe si agara ya.
Esther 2:11 in English
Esther 2:11 · Berean Standard Bible
And every day Mordecai would walk back and forth in front of the court of the harem to learn about Esther’s welfare and what was happening to her.
Context
9Ọ masịrị ya, ọ natakwara ihuọma nʼebe ọ nọ. Ngwangwa ọ malitere inye ya nri pụrụ iche, na ihe ndị ahụ niile e ji edozi ahụ na ịchọ mma. O sitere nʼetiti ụmụ agbọghọ nọ nʼụlọeze họpụta ụmụ agbọghọ asaa ndị na-ejere Esta ozi. O duuru ya na ndị na-ejere ya ozi dubaa nʼebe kachasị mma nʼogige ebe ndị inyom eze bi. 10Ma Esta agwabeghị onye ọbụla obodo ya maọbụ ihe banyere ezinaụlọ ya, nʼihi na Mọdekai nyere ya iwu ka ọ ghara ịgwa onye ọbụla. 11Ụbọchị niile, Mọdekai na-abịa nʼogige ụlọ ndị inyom na-ajụ ase otu Esta mere, nʼịchọpụta otu ihe si agara ya. 12Tupu o ruoro nwaagbọghọ ọbụla ibakwuru eze Sekses, ọ ga-anọzu ọnwa iri na abụọ nʼebe a na-achọ ya mma dịka iwu e nyere banyere ịchọ mma ndị inyom si dị. A ga-eji mmanụ máá chọọ ya mma ọnwa isii, werekwa mmanụ isi ụtọ dị iche iche, na ihe ịchọ mma ndị ọzọ kwadoo ya nʼime ọnwa isii nke ọzọ. 13Nʼụzọ dị otu a, ka nwaagbọghọ ọbụla ga-adị gakwuru eze, bụ Sekses. A na-enye ya ihe ọbụla ọ chọrọ site nʼebe obibi ha nke o ji aba nʼụlọeze.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.