Native Bible

Esther 1:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihe ịchọ mma e ji dozie ogige ahụ bụ ezi akwa mgbochi dị ọcha, nke e ji ogho ọcha kpaa na nke e jikwa ogho na-acha anụnụ anụnụ kpaa. E jikwa eriri ogho dị ezi ọcha na nke na-acha odo odo kekọtaa akwa mgbochi ndị ahụ, nʼihe mgbaaka ọlaọcha dị nʼogidi nkume dị oke ọnụahịa e wuru nʼebe ahụ. A dọbakwara oche* ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ nʼebe e wulitụrụ elu, nke e ji nkume mabụl na nkume ndị ọzọ dị oke ọnụahịa, ndị na-acha ezi ọcha, ndị na-acha odo odo na nke na-eji oji wuo ala ya.

Esther 1:6 in English

Esther 1:6 · Berean Standard Bible

Hangings of white and blue linen were fastened with cords of fine white and purple material to silver rings on the marble pillars. Gold and silver couches were arranged on a mosaic pavement of porphyry, marble, mother-of-pearl, and other costly stones.

Context

4Mmemme a were otu narị na iri ụbọchị asatọ (180). Eze jikwa oge a gosi akụnụba, na ịma mma na ebube nke alaeze ya. 5Mgbe ụbọchị ndị a gafesịrị, eze kpọrọ oke oriri nọrọ ụbọchị asaa nʼubi a gbara ogige dị nʼụlọeze, nye ndị niile nọ na Susa, site nʼonye ukwu ruo nʼonye nta. 6Ihe ịchọ mma e ji dozie ogige ahụ bụ ezi akwa mgbochi dị ọcha, nke e ji ogho ọcha kpaa na nke e jikwa ogho na-acha anụnụ anụnụ kpaa. E jikwa eriri ogho dị ezi ọcha na nke na-acha odo odo kekọtaa akwa mgbochi ndị ahụ, nʼihe mgbaaka ọlaọcha dị nʼogidi nkume dị oke ọnụahịa e wuru nʼebe ahụ. A dọbakwara oche* ọlaọcha na ọlaedo ndị ahụ nʼebe e wulitụrụ elu, nke e ji nkume mabụl na nkume ndị ọzọ dị oke ọnụahịa, ndị na-acha ezi ọcha, ndị na-acha odo odo na nke na-eji oji wuo ala ya. 7E jikwa iko ọlaedo ṅụọ ihe ọṅụṅụ. Iko ọlaedo ọbụla e wepụtara nʼụbọchị ahụ dị iche nʼiche. O nweghị nke yiri ibe ya. E mekwara ka mmanya eze baa ụba dịka afọ ọma aka eze si dị. 8E nyeghịkwa iwu ọbụla banyere iko mmanya ole mmadụ kwesiri ịṅụ kama ndị chọrọ ga-aṅụ dịka o si masị ha. Nʼihi na eze agwalarị ndịisi ozi ya na onye ọbụla kwesiri ịṅụ dịka o si chọọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.