Esta 1:2
Esther 1:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼoge ahụ, isi ọchịchị obodo eze Sekses bụ Susa* ebe ocheeze ya dịkwa.
Esther 1:2 in English
Esther 1:2 · Berean Standard Bible
In those days King Xerxes sat on his royal throne in the citadel of Susa.
Context
1Nke a bụ ihe mere nʼoge ọchịchị eze Sekses, bụ Sekses nke chiri alaeze* nwere mpaghara dị iche iche nke karịrị otu narị na iri abụọ na asaa (127), nke gbasakwara site nʼIndia rụọ Kush.* 2Nʼoge ahụ, isi ọchịchị obodo eze Sekses bụ Susa* ebe ocheeze ya dịkwa. 3Nʼafọ nke atọ nke ọchịchị ya, o mere mmemme oke oriri nye ndịisi ọrụ ya niile. Ndị ọzọ ọ kpọkwara bụ ndịisi agha nke Peshịa na Midia, na ụmụ eze, na ndị ọchịchị sitere na mba dị iche iche ọ na-achị. 4Mmemme a were otu narị na iri ụbọchị asatọ (180). Eze jikwa oge a gosi akụnụba, na ịma mma na ebube nke alaeze ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.