Native Bible

Ephesians 4:22 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Yipụnụ mmadụ ochie unu, nke mere ka unu na-ebi ndụ ọjọọ na mbụ, bụ mmadụ ochie ahụ nke jupụtara nʼagụụ ime ihe ọjọọ niile,

Ephesians 4:22 in English

Ephesians 4:22 · Berean Standard Bible

to put off your former way of life, your old self, which is being corrupted by its deceitful desires;

Context

20Ma nke a abụghị otu unu siri mụta Kraịst, 21ma ọ bụrụ na unu anụla ihe banyere ya, ọ bụrụkwa na unu amụtala ihe site nʼaka ya banyere eziokwu ahụ dị nʼime Jisọs. 22Yipụnụ mmadụ ochie unu, nke mere ka unu na-ebi ndụ ọjọọ na mbụ, bụ mmadụ ochie ahụ nke jupụtara nʼagụụ ime ihe ọjọọ niile, 23ka eme ka mmụọ nke uche unu dị ọhụrụ. 24Ma yikwasịnụ onwe unu mmadụ ọhụrụ, nke e kere nʼụdịdị Chineke nʼezi omume nʼezie nakwa nʼịdị nsọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.