Ndị Efesọs 4:15
Ephesians 4:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kama nʼikwu eziokwu site na mmụọ ịhụnanya, anyị ga-eto bụrụ ndị tozuru oke nʼakụkụ niile nʼime ya, bụ onye ahụ bụ isi, nke bụ Kraịst.
Ephesians 4:15 in English
Ephesians 4:15 · Berean Standard Bible
Instead, speaking the truth in love, we will in all things grow up into Christ Himself, who is the head.
Context
13tutu anyị niile abịa na nkwekọta banyere okwukwe anyị, na ọmụma ihe banyere ọkpara Chineke, bụrụ onye tozuru oke, ruo ọtụtụ nke ogogo na ozuzu oke nke Kraịst. 14Mgbe ahụ anyị agaghị abụkwa ụmụntakịrị, ndị ikuku ozizi ọhụrụ dị iche iche na-ebugharị ihu na azụ dị ka ebili mmiri, na ịgha ụgha nke mmadụ, bụ ozizi na-esite nʼime aghụghọ nke ha ji echepụta nduhie. 15Kama nʼikwu eziokwu site na mmụọ ịhụnanya, anyị ga-eto bụrụ ndị tozuru oke nʼakụkụ niile nʼime ya, bụ onye ahụ bụ isi, nke bụ Kraịst. 16Onye anụ ahụ niile, jikọtara ọnụ ma bụrụ otu, site na nkwonkwo niile nke na-enyezu ya nkwado, dịka akụkụ niile ọbụla na-arụ ọrụ ya nke ọma, na-esite nʼụzọ ahụ enyere akụkụ ndị ọzọ aka, ime ka ha too, nakwa iwuli ha elu site nʼịhụnanya. 17Ya mere, ana m ekwu nke a, ma na-eguzokwa na ya nʼime Onyenwe, ka unu hapụ ibi ndụ dị ka ndị mba ọzọ si ebi, na echiche ha na-abaghị uru.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.