Native Bible

Ephesians 3:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụ nʼihi nke a ka m na-egbu ikpere m nʼala nʼihu Nna anyị,

Ephesians 3:14 in English

Ephesians 3:14 · Berean Standard Bible

... for this reason I bow my knees before the Father,*

Context

12bụ onye anyị nwere ntụkwasị obi na obi siri ike ịbịakwute site nʼokwukwe anyị nwere na ya. 13Nʼihi nke a, arịọ m ka unu ghara ịda mba maka mkpagbu m nʼihi unu, ha bụ otuto nye unu. 14Ọ bụ nʼihi nke a ka m na-egbu ikpere m nʼala nʼihu Nna anyị, 15onye ezinaụlọ niile dị nʼụwa a na nke dị nʼeluigwe na-esite nʼaka ya enwe aha. 16Ekpere m bụ ka o site nʼịba ụba nke otuto ya, nye unu ike na-esite na Mmụọ ya, mee ka unu dị ike nʼime mmụọ unu;

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.