Ekiliziastis 8:9
Ecclesiastes 8:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihe ndị a niile ka m hụrụ, mgbe m na-atụgharị uche banyere ihe niile a na-eme nʼokpuru anyanwụ. Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-emegide ibe ya si otu a wetara onwe ya nsogbu.
Ecclesiastes 8:9 in English
Ecclesiastes 8:9 · Berean Standard Bible
All this I have seen, applying my mind to every deed that is done under the sun; there is a time when one man lords it over another to his own detriment.
Context
7Ebe ọ bụ na o nweghị onye mara ihe na-aga ime,
onye pụrụ ịgwa ibe ya ihe gaje ime? 8Ọ dịghị onye nwere ike igbochi mmụọ mmadụ* mgbe ọ chọrọ.
Ọ dịghị onye nwere ike igbochi ụbọchị ọnwụ ya.
Dịka o si sie ike izighachi mmadụ azụ nʼoge agha,
otu a ka o si sie ike ajọ omume ịtọghapụ ndị na-eme ihe ọjọọ. 9Ihe ndị a niile ka m hụrụ, mgbe m na-atụgharị uche banyere ihe niile a na-eme nʼokpuru anyanwụ. Mgbe ụfọdụ, mmadụ na-emegide ibe ya si otu a wetara onwe ya nsogbu. 10Ọzọkwa, ahụrụ m ebe e liri ndị ajọ omume, ndị na-abata na apụkwa site nʼebe dị nsọ, a na-etokwa ha nʼobodo ebe ha mere ihe ndị a. Nke a bụkwa nnọọ ihe na-enweghị isi; ihe efu. 11Nʼihi na e nyeghị ntaramahụhụ mmehie mgbe o kwesiri, obi ndị mmadụ na-ejupụta nʼatụmatụ ime mmehie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.