Native Bible

Deuteronomy 9:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu kpasuru Onyenwe anyị iwe nʼugwu Horeb, ya mere o jiri were iwe laa unu nʼiyi.

Deuteronomy 9:8 in English

Deuteronomy 9:8 · Berean Standard Bible

At Horeb * you provoked the LORD, and He was angry enough to destroy you.

Context

6Ya mere, ghọta ya nke ọma na Onyenwe anyị Chineke gị anaghị enye gị ezi ala a ka inweta ya nʼihi ezi omume gị, nʼihi na unu bụ ndị isiike. 7Chetakwa nke a ma echefukwala otu i si kpasuo Onyenwe anyị Chineke gị iwe, mgbe mgbe, nʼime ọzara. Site nʼụbọchị ị hapụrụ Ijipt tutu ruo taa, ka ị na-enupu isi nʼebe Onyenwe anyị nọ. 8Unu kpasuru Onyenwe anyị iwe nʼugwu Horeb, ya mere o jiri were iwe laa unu nʼiyi. 9Mgbe m rigooro nʼelu ugwu ahụ ịnata mbadamba nkume ndị ahụ bụ mbadamba nkume ọgbụgba ndụ dị nʼetiti Onyenwe anyị na unu, anọrọ m nʼelu ugwu ahụ iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, ọ dịghị nri m riri, ọ dịghịkwa mmiri m ṅụrụ. 10Onyenwe anyị nyere m mbadamba nkume abụọ ndị ahụ, nke eji mkpịsịaka Chineke dee. Edekwasịrị nʼelu ha iwu niile nke Onyenwe anyị gwara unu nʼugwu ahụ site nʼetiti ọkụ, nʼụbọchị mkpọkọta ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.