Native Bible

Deuteronomy 9:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Elekwasịla nnupu isi ha na isiike ha anya, kama, cheta nkwa gị, nke i kwere ndị ohu gị, Ebraham, Aịzik, na Jekọb. Biko, agụnyela ndụ ọjọọ ha, na mmehie ha megide ha.

Deuteronomy 9:27 in English

Deuteronomy 9:27 · Berean Standard Bible

Remember Your servants Abraham, Isaac, and Jacob. Overlook the stubbornness of this people and the wickedness of their sin.

Context

25Ọ bụ ya mere m jiri daa nʼala nʼihu Onyenwe anyị iri ụbọchị anọ, ehihie na abalị, nʼihi na Onyenwe anyị kwuru na ọ ga-ala unu nʼiyi. 26Ekpere m ekpere nʼoge ahụ nye Onyenwe anyị sị ya, “Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị biko, alala ndị gị nʼiyi, nʼihi na ha bụ ihe nketa gị, bụrụkwa ndị i ji ike aka gị na ebube gị gbapụta site nʼIjipt. 27Elekwasịla nnupu isi ha na isiike ha anya, kama, cheta nkwa gị, nke i kwere ndị ohu gị, Ebraham, Aịzik, na Jekọb. Biko, agụnyela ndụ ọjọọ ha, na mmehie ha megide ha. 28Ma ọ bụghị otu a, ndị obodo ahụ nke i si na ya kpọpụta anyị ga-asị, ‘Ọ bụ nʼihi na Onyenwe anyị apụghị inye ha ala o kwere ha na nkwa ka o ji laa ha nʼiyi. Nʼihi na ọ kpọrọ ha asị, ka o ji kpọbata ha nʼime ọzara mee ka ha nwụọ nʼebe ahụ.’ 29Ma ha bụ ndị gị, ha bụkwa ihe nketa gị. Ha bụ ndị i sitere nʼike gị dị egwu na ike nke aka gị kpọpụta site nʼIjipt.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.