Diuteronomi 8:9
Deuteronomy 8:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụkwa ala jupụtara nʼihe oriri, ebe a na-agaghị enwe ụkọ nri. Ọ bụ ala ebe igwe jupụtara nʼime ya dị ka ha bụ nkume, ala ebe ọla jupụtakwara nʼugwu ya niile.
Deuteronomy 8:9 in English
Deuteronomy 8:9 · Berean Standard Bible
a land where you will eat food without scarcity, where you will lack nothing; a land whose rocks are iron and whose hills are ready to be mined for copper.
Context
7Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke gị na-ewebata gị nʼala mara mma, bụ ala nwere iyi, na ọdọ mmiri, ala nwere mmiri nke si nʼime ya na-asọpụta asọgharị nʼugwu na ndagwurugwu, 8ọ bụ ala na-epu ọka wiiti na ọka balị, na osisi vaịnị, na osisi fiig, na osisi pomegranet, na mmanụ oliv, na mmanụ aṅụ. 9Ọ bụkwa ala jupụtara nʼihe oriri, ebe a na-agaghị enwe ụkọ nri. Ọ bụ ala ebe igwe jupụtara nʼime ya dị ka ha bụ nkume, ala ebe ọla jupụtakwara nʼugwu ya niile. 10Mgbe i riri rijuo afọ, too Onyenwe anyị Chineke gị nʼihi ala mara mma nke o nyere gị. 11Ma lezie anya ka ị ghara ichefu Onyenwe anyị Chineke gị, na-edebeghị iwu ya niile, na ikpe ya niile, na ụkpụrụ ya niile, nke m na-enye gị taa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.