Diuteronomi 8:19
Deuteronomy 8:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ bụrụ na i chefuo Onyenwe anyị bụ Chineke gị, gbasoo chi ndị ọzọ, fee ha ofufe ma kpọọkwa isiala nye ha, ana m agba ama megide gị taa na ị ghaghị ịla nʼiyi.
Deuteronomy 8:19 in English
Deuteronomy 8:19 · Berean Standard Bible
If you ever forget the LORD your God and go after other gods to worship and bow down to them, I testify against you today that you will surely perish.
Context
17I nwere ike kwuo sị, “Ọ bụ site nʼike aka m ka m ji baa ụba.” 18Ma cheta Onyenwe anyị Chineke gị, nʼihi na ọ bụ ya onwe ya na-enye gị ike i ji akpata akụ, ime ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike, bụ nke ọ ṅụrụ nna nna gị ha nʼiyi, dịka ọ dị taa. 19Ma ọ bụrụ na i chefuo Onyenwe anyị bụ Chineke gị, gbasoo chi ndị ọzọ, fee ha ofufe ma kpọọkwa isiala nye ha, ana m agba ama megide gị taa na ị ghaghị ịla nʼiyi. 20Ọ bụrụ na unu egeghị ntị nʼolu Onyenwe anyị Chineke unu, ime ihe ọ chọrọ, ọ ga-ala unu nʼiyi, dịka o si bibie mba ndị a niile dị iche iche ọ na-ebibi nʼihi unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.