Native Bible

Deuteronomy 7:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Unu na ha alụrịtakwala di na nwunye, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụọ, maọbụ lụtara ụmụ unu ndị ikom ụmụ ha ndị inyom.

Deuteronomy 7:3 in English

Deuteronomy 7:3 · Berean Standard Bible

Do not intermarry with them. Do not give your daughters to their sons or take their daughters for your sons,

Context

1Mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu ga-akpọbata unu nʼala ahụ unu na-abanye inweta, mgbe o si nʼihu unu chụpụ ọtụtụ mba ndị a nʼihu unu, bụ ndị Het, ndị Gigash, ndị Amọrait, ndị Kenan, ndị Periz, ndị Hiv na ndị Jebus, bụ mba asaa ndị dị ike nke ukwuu, baakwa ụba karịa unu; 2mgbe Onyenwe anyị bụ Chineke unu nyefere ha nʼaka unu, unu meriekwa ha, lezienụ anya hụ na unu bibiri ha kpamkpam. Ka unu na ha ghara ịgba ndụ, unu emekwarala ha ebere. 3Unu na ha alụrịtakwala di na nwunye, unu enyekwala ụmụ ha ndị ikom ụmụ unu ndị inyom ka ha lụọ, maọbụ lụtara ụmụ unu ndị ikom ụmụ ha ndị inyom. 4Nʼihi na nke a ga-eme ka ụmụ unu site nʼiso m tụgharịa, malite ife chi ndị ọzọ. Mgbe ahụ iwe Onyenwe anyị ga-adị ọkụ megide unu, laakwa unu nʼiyi ngwangwa. 5Kama otu a ka unu ga-eme: tikpọọnụ ebe ịchụ aja ha niile. Kụrienụ ogidi arụsị ha niile. Gbutukwaanụ osisi Ashera ha, ma suo arụsị ha niile ọkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.