Diuteronomi 7:23
Deuteronomy 7:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ha nʼaka unu, ọ ga-etinye ha oke ọgbaaghara nʼobi, tutu ruo mgbe ha lara nʼiyi.
Deuteronomy 7:23 in English
Deuteronomy 7:23 · Berean Standard Bible
But the LORD your God will give them over to you and throw them into great confusion, until they are destroyed.
Context
21Unu amala jijiji nʼihu ha, nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke unu, onye nọ nʼetiti unu bụ Chineke dị ukwuu, dịkwa egwu. 22Onyenwe anyị bụ Chineke unu, ga-achụpụ mba ndị a ntakịrị ntakịrị. Ọ gaghị ekwe ka unu chụpụ ha otu ugboro, ma ọ bụghị ya, ụmụ anụ ọhịa ọjọọ ga-amụba megide unu. 23Onyenwe anyị Chineke unu ga-enyefe ha nʼaka unu, ọ ga-etinye ha oke ọgbaaghara nʼobi, tutu ruo mgbe ha lara nʼiyi. 24Eze ha niile ka ọ ga-enyefe nʼaka unu, unu ga-ehichapụkwa aha ha nʼelu ụwa. Ọ dịkwaghị onye pụrụ iguzo nʼihu unu, nʼihi na unu ga-ebibi ha niile. 25Kpọọnụ arụsị niile nke apịrị apị nke chi niile ha ọkụ. Unu enwela anya ukwu nʼebe ọlaọcha maọbụ ọlaedo dị ha nʼahụ dị. Unu ewerela ya ka ọ bụrụ nke unu, ka unu ghara ịbụ ndị ọ matara nʼọnya, nʼihi na ọ bụ ihe arụ nye Onyenwe anyị bụ Chineke unu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.