Diuteronomi 4:6
Deuteronomy 4:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lezienụ anya hụ na unu debere ha, nʼihi na nke a ga-egosi mba gbara unu gburugburu na unu bụ ndị nwere nghọta na amamihe. Nʼihi na mgbe ha nụrụ banyere ụkpụrụ ndị a, ha ga-ekwu okwu sị, “Nʼezie, ndị jupụtara na mba ukwu a bụ ndị nwere nghọta na amamihe.”
Deuteronomy 4:6 in English
Deuteronomy 4:6 · Berean Standard Bible
Observe them carefully, for this will show your wisdom and understanding in the sight of the peoples, who will hear of all these statutes and say, “Surely this great nation is a wise and understanding people.”
Context
4Ma unu niile nọgidesịrị ike soro Onyenwe anyị Chineke unu bụ ndị dị ndụ taa. 5Lee, ezila m unu ụkpụrụ na iwu niile Onyenwe anyị Chineke m sị m zi unu, iwu unu na-aghaghị idebe nʼala ahụ unu na-aga inweta. 6Lezienụ anya hụ na unu debere ha, nʼihi na nke a ga-egosi mba gbara unu gburugburu na unu bụ ndị nwere nghọta na amamihe. Nʼihi na mgbe ha nụrụ banyere ụkpụrụ ndị a, ha ga-ekwu okwu sị, “Nʼezie, ndị jupụtara na mba ukwu a bụ ndị nwere nghọta na amamihe.” 7Olee mba ọzọ dị ukwuu, nke e mere ka chi ha nọọ ha nso dịka Onyenwe anyị Chineke anyị si na-anọ anyị nso mgbe ọbụla anyị kpọkuru ya nʼekpere? 8Olee mba ukwu ọzọ dịkwa nke nwere ụkpụrụ na iwu ziri ezi dịka iwu ndị a m na-enye unu taa?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.