Native Bible

Deuteronomy 4:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Obodo ndị ahụ bụ, Beza, nke dị nʼugwu elu ya dị larịị nʼime ọzara. A họpụtara ya maka ebo Ruben. Ramọt, nke dị na Gilead, maka ebo Gad, na Golan, nke dị na Bashan, maka ebo Manase.

Deuteronomy 4:43 in English

Deuteronomy 4:43 · Berean Standard Bible

Bezer in the wilderness on the plateau belonging to the Reubenites, Ramoth in Gilead belonging to the Gadites, or Golan in Bashan belonging to the Manassites.

Context

41Mgbe ahụ, Mosis họpụtara obodo atọ nʼofe ọwụwa anyanwụ nke osimiri Jọdan, 42ebe onye ọbụla gburu mmadụ ga-agbaba ọsọ ndụ, ma ọ bụrụ na ha gburu onye agbataobi ha na-amaghị ama, na-akpọghị ya asị na mgbe gara aga. Ọ ga-agbaba nʼotu ime obodo ndị a ichebe ndụ ya. 43Obodo ndị ahụ bụ, Beza, nke dị nʼugwu elu ya dị larịị nʼime ọzara. A họpụtara ya maka ebo Ruben. Ramọt, nke dị na Gilead, maka ebo Gad, na Golan, nke dị na Bashan, maka ebo Manase. 44Nke a bụ iwu Mosis chere nʼihu ụmụ Izrel. 45Ndị a bụ ihe ama, na ụkpụrụ, na iwu Mosis nyere ụmụ Izrel nke ha aghaghị idebe mgbe ha si nʼIjipt pụta

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.