Diuteronomi 4:38
Deuteronomy 4:38 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka o site nʼihu unu chụpụ mba dị ukwuu na ndị dị ike, ma kpọbata unu nʼala ha, inye unu ala ahụ dịka ihe nketa unu, dị ka o si dị taa.
Deuteronomy 4:38 in English
Deuteronomy 4:38 · Berean Standard Bible
to drive out before you nations greater and mightier than you, and to bring you into their land and give it to you for your inheritance, as it is this day.
Context
36O sitere nʼeluigwe mee ka unu nụ olu ya maka ịdọ unu aka na ntị. Nʼụwa, o mere ka unu hụ oke ogidi ọkụ ahụ o wuru, unu nụkwara olu ya nʼetiti ọkụ ahụ. 37Nʼihi ịhụnanya o nwere nʼebe nna nna unu nọ na nʼihi nhọpụta ọ họpụtara ụmụ ụmụ ha, ka o ji si nʼIjipt dupụta unu nʼihu ya. Ọ bụkwa ike aka ya ka o ji mezuo nke a. 38Ka o site nʼihu unu chụpụ mba dị ukwuu na ndị dị ike, ma kpọbata unu nʼala ha, inye unu ala ahụ dịka ihe nketa unu, dị ka o si dị taa. 39Matanụ nke ọma, ma nabata okwu a nʼobi unu na Onyenwe anyị bụ Chineke nʼeluigwe na nʼụwa. O nwekwaghị chi ọzọ dị ma ọ bụghị ya. 40Debenụ ụkpụrụ ya na iwu ndị a niile m na-enye unu taa, ka ihe niile gaara unu na ụmụ unu nke ọma, ka unu biekwa nʼala ahụ Onyenwe anyị Chineke na-enye unu ruo mgbe niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.